< ᏉᎳ ᎡᏈᏌ ᎠᏁᎯ ᏧᏬᏪᎳᏁᎸᎯ 2 >

1 ᏂᎯᏃ ᏗᏥᏲᎱᏒᎯ ᏥᎨᏒ ᎤᏣᏘᏂ ᏂᏣᏛᏁᎸ ᎠᎴ ᎢᏥᏍᎦᏅᏨᎢ; —
Ma unu onwe unu, unu nwụrụ anwụ site na njehie ụzọ na mmehie unu.
2 ᎾᎿᎭᏂ ᏧᏩᎫᏔᏅᏒ ᎢᏤᏙᎸᎢ ᎾᏍᎩᏯ ᎢᏳᎾᏛᏁᏗ ᎨᏒ ᎡᎶᎲ ᎠᏁᎯ, ᎾᏍᎩᏯ [ ᎤᏚᎵᏍᎬ ] ᎦᏃᎴᏍᎬ ᎡᎯ ᎡᎬᏫᏳᏌᏕᎩ, ᎾᏍᎩ ᎠᏓᏅᏙ ᎪᎯ ᎨᏒ ᏥᏚᎸᏫᏍᏓᏁ ᏚᎾᏓᏅᏛ ᎪᎯᏳᏗ ᏂᎨᏒᎾ ᎨᏒ ᏧᏪᏥ; (aiōn g165)
Nke unu biri ndụ nʼime ha mgbe unu na-agbaso ụzọ niile nke ụwa a, na ụzọ onye ọchịchị nke alaeze ikuku, bụ mmụọ ahụ na-arụ ọrụ ugbu a na ndụ ndị ahụ na-enupu isi. (aiōn g165)
3 ᎾᏍᎩ ᎾᏍᏉ ᏧᏩᎫᏔᏅᏒ ᏂᏗᎥ ᎨᏓᎵᎪᏁᎲᎩ ᎾᎿᎭᎢᎩᏇᏓᎸ ᎤᎬᎥᏍᎬᎢ, ᎠᎴ ᎤᏇᏓᎸ ᎠᎴ ᎠᏓᏅᏖᏗ ᎨᏒ ᎤᎾᏚᎵᏍᎬ ᏂᏓᏛᏁᎲᎩ; ᎠᎴ ᏗᎦᏕᏅ ᏂᎦᏍᏛ ᎤᏔᎳᏬᎯᏍᏗ ᎨᏒ ᏧᏪᏥ ᎨᏒᎩ, ᎾᏍᎩᏯᏉ ᎠᏂᏐᎢ ᏄᎾᏍᏛᎢ.
Anyị niile bikwara ndụ anyị nʼetiti ha, nʼoge gara aga, na-emejupụta agụụ nke anụ ahụ mmehie, ma na-agbaso ọchịchọ ya na ebumnuche ya. Nʼihi na site nʼọdịdị anyị, anyị na ndị ọzọ nọ nʼọmụma ikpe ya.
4 ᎠᏎᏃ ᎤᏁᎳᏅᎯ ᎤᏪᎿᎭᎢᏳ ᏥᎩ ᎤᏓᏙᎵᏍᏗ ᎨᏒᎢ, ᏥᏅᏗᎦᎵᏍᏙᏗᏍᎨ ᎤᏣᏘ ᎤᏓᎨᏳᏗ ᎨᏒ ᏧᏩᏔᏁ ᎠᏴ ᎢᎩᎨᏳᎯᏳ ᏥᏄᎵᏍᏔᏁᎢ,
Chineke onye jupụtara nʼobi ebere, maka oke ịhụnanya o nwere nʼebe anyị nọ,
5 ᎾᏍᎩ ᎠᏍᎦᏅᎢᏍᏗ ᎨᏒ ᏗᎩᏲᎱᏒᎯ ᏥᎨᏒᎩ, ᎢᎬᏂᏛ ᎢᎦᏠᏯᏍᏔᏅ ᎦᎶᏁᏛ ᎠᎬᏂᏛᎢ, ( ᎬᏩᎦᏘᏯ ᏅᏓᏙᎵᏍᏗ ᎨᏒ ᎡᏥᏍᏕᎸᏔᏅ; )
mere ka anyị soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ; ọ bụladị mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime ajọ omume. Ọ bụ site nʼamara ya ka e ji zọpụta unu.
6 ᎠᎴ ᎢᏧᎳᎭ ᏕᎦᎴᎯᏐᏔᏅ, ᎠᎴ ᎢᏧᎳᎭ ᎢᎦᏅᏗᏱ ᏂᎬᏁᎸ ᎦᎸᎳᏗ ᏗᎨᏒ ᎦᎶᏁᏛ ᏥᏌ ᎢᏳᏩᏂᏌᏛ;
Ọ kpọlitere anyị na ya, mee ka anyị nọdụ ọdụ nʼebe niile nke eluigwe nʼime Kraịst Jisọs.
7 ᎾᏍᎩ Ꮎ ᏭᏩᎫᏗᏗᏒ ᎬᏂᎨᏒ ᎢᏳᏩᏁᏗᏱ ᏂᎦᎥ ᎤᏪᎿᎭᎢᏳ ᎨᏒ ᎬᏩᎦᏘᏯ ᎤᏓᏙᎵᏍᏗ ᎨᏒᎢ, ᏂᎦᎥ ᎣᏍᏛ ᏂᎦᏛᏁᎲ ᎦᎶᏁᏛ ᏥᏌ ᏅᏓᏳᏓᎴᏅᎯ. (aiōn g165)
O mere nke a igosi ọgbọ nke na-abịa, ịdị ukwuu nke akụ amara ya, nke o sitere nʼobiọma ya gosi anyị nʼime Kraịst Jisọs. (aiōn g165)
8 ᎬᏩᎦᏘᏯᏰᏃ ᎤᏓᏙᎵᏍᏗ ᎨᏒ ᎡᏥᏍᏕᎸᏙᏔᏅᎯ ᎪᎯᏳᏗ ᎨᏒ ᎬᏔᏅᎯ; ᎠᎴ ᎾᏍᎩ ᎥᏝ ᎢᏨᏒ ᎨᏒ ᏅᏓᏳᏓᎴᏅᎯ; ᎤᏁᎳᏅᎯ ᎤᎵᏍᎪᎸᏔᏅᎯ;
Nʼihi na ọ bụ site nʼamara ka e ji zọpụta unu site nʼokwukwe. Nke a abụghị ihe unu rụpụtara nʼonwe unu, ọ bụ onyinye nke Chineke.
9 ᎥᏝ ᏗᎦᎸᏫᏍᏓᏁᏗ ᎨᏒ ᎢᏳᏩᏂᏌᏛ ᏱᎩ, ᎾᏍᎩ ᎩᎶ ᎤᏢᏈᏍᏗᏱ ᏂᎨᏒᎾ ᎢᏳᎵᏍᏙᏗᏱ.
O siteghị nʼọrụ, ka onye ọbụla ghara ịnya isi.
10 ᎾᏍᎩᏰᏃ ᎠᏴ ᎢᎪᏢᏅᎯ, ᎦᎶᏁᏛ ᏥᏌ ᎢᏳᏩᏂᏌᏛ ᎡᎪᏢᏅᎯ ᎣᏍᏛ ᏗᎩᎸᏫᏍᏓᏁᏗᏱ, ᎤᏁᎳᏅᎯ ᎾᏍᎩ ᏥᏂᎦᏛᏅᎢᏍᏓᏁᏟ ᎾᎿᎭᎢᎨᏓᏍᏗᏱ.
Nʼihi na anyị bụ akaọrụ ya, nke o kere nʼime Kraịst Jisọs nʼihi ịrụ ezi ọrụ. Ọ bụ otu a ka Chineke siri kwadoo na anyị kwesiri ibi ndụ ụbọchị niile.
11 ᎾᏍᎩ ᎢᏳᏍᏗ ᎢᏣᏅᏖᏍᏗ ᎾᏍᎩ ᏂᎯ ᏧᏩᎫᏔᏅᏒ ᏗᏣᏓᎴᏅᏛ ᏴᏫ ᎤᏇᏓᎵ ᎨᏒᎢ, ᏂᏗᎨᏥᎤᏍᏕᏎᎸᎾ ᎨᏦᏎᎸᎯ ᎾᏍᎩ Ꮎ ᏗᎨᏥᎤᏍᏕᏎᎸᎯ ᎨᎪᏎᎯ ᏥᎩ, ᎾᏍᎩ ᎤᏇᏓᎸ ᏗᎨᏥᎤᏍᏕᏎᎸᎯ ᏗᎪᏱ ᏗᎬᏔᏅᎯ;
Ya mere, chetanụ na nʼoge gara aga, unu bụ ndị mba ọzọ site nʼọmụmụ nke a mụrụ unu. Chetakwanụ na “ndị e biri ugwu” na-akpọkwa unu “ndị a na-ebighị ugwu” (nʼihi obibi ugwu nʼanụ ahụ nke eji aka bie).
12 ᎾᏍᎩ ᎾᎯᏳ ᏥᎨᏎ ᎦᎶᏁᏛ ᏂᏤᎲᎾ ᎨᏎᎢ, ᏂᏤᎸᎾᏉ ᎨᏎ ᎢᏏᎵ ᎠᏰᎵ ᎤᏃᏢᏒᎢ, ᎠᎴ ᎢᏥᎪᏁᎳ ᎨᏎ ᎧᏃᎮᏛ ᏓᏠᎯᏍᏛ ᎠᏚᎢᏍᏛᎢ, ᎤᏚᎩ ᏂᏨᏒᎾ, ᎠᎴ ᎤᏁᎳᏅᎯ ᏂᏤᎲᎾ ᎨᏎ ᎠᏂ ᎡᎶᎯ.
Nʼoge ahụ, ọ dịghị ihe jikọtara unu na Kraịst. E kewapụtara unu site na mmekọrịta nke Izrel, bụrụkwa ndị ọbịa nʼọgbụgba ndụ ahụ, na-enweghị olileanya na-enweghịkwa Chineke nʼime ụwa.
13 ᎪᎯᏍᎩᏂ ᏥᎩ, ᎦᎶᏁᏛ ᏥᏌ ᎢᏳᏩᏂᏌᏛ, ᏂᎯ, ᎢᏅᎯᏳ ᏥᏂᏣᏛᎿᎭᏕᎬᎩ, ᎾᎥ ᏕᏣᏘᏃᎸ ᎬᏔᏅᎯ ᎤᎩᎬ ᎦᎶᏁᏛ.
Ma ugbu a nʼime Kraịst Jisọs, unu bụ ndị nọ nʼebe dị anya nʼoge gara aga, ka e mere ka unu bịaruo nso site nʼọbara Kraịst nke a wụsiri.
14 ᎢᎪᎯᏍᏓᏁᎯᏰᏃ ᎾᏍᎩ, ᎢᏧᎳ ᏌᏉᏉ ᎢᎬᏁᎸᎯ, ᎠᎴ ᎤᏲᏍᏔᏅᎯ ᎢᎦᏓᏓᎴᏗᏍᎩ ᎠᏐᏴᎢ;
Nʼihi na ya onwe ya bụ udo anyị, o mere ka ụzọ otu abụọ bụrụ otu ihe nʼime ahụ ya, site na ịkwatu mgbidi kewara ha na mgbe ochie, bụ mgbidi nke ịkpọ asị dị nʼetiti anyị.
15 ᎤᏇᏓᎸ ᎬᏗᏍᎬ ᎤᏛᏔᏅ ᏗᏓᏓᏍᎦᎩ ᎢᎬᏁᎯ, ᎾᏍᎩ ᏯᏛᏅ ᏗᎧᎿᎭᏩᏛᏍᏗ ᎤᎵᏁᏨᎢ ᏧᏓᎴᏅᏛ ᎢᏯᏛᏁᎵᏓᏍᏗ ᎨᏒᎢ; ᎾᏍᎩ ᎠᏂᏔᎵ ᎨᏒ ᏌᏉ ᎢᏤ ᏴᏫ ᎤᏬᏢᏗᏱ ᎤᏩᏒ ᎢᏳᏩᏂᏐᏗᏱ, ᎾᏍᎩᏃ ᏙᎯ ᎢᏳᏩᏁᏗᏱ;
Ọ bụ nʼime anụ ahụ ya ka ọ mere ka iwu ahụ na ụkpụrụ ya niile ghara ịdị ire. Ebumnobi ya bụ i kee nʼime onwe ya otu onye ọhụrụ site na mmadụ abụọ ahụ, si otu a mee ka udo dịrị.
16 ᎠᎴ ᎾᏍᎩ ᎢᏳᏩᏂᏐᏗᏱ ᎢᏧᎳ ᏌᏉ ᎠᏰᎸ ᏄᎾᏛᏅ ᏙᎯᏱ ᎢᏳᏅᏁᏗᏱ ᎤᏁᎳᏅᎯ, ᏓᏓᎿᎭᏩᏍᏛ ᎤᏮᏙᏗᏱ, ᎾᏍᎩ ᎤᏮᏔᏅ ᎤᎸ ᏓᎾᏓᏍᎦᎬᎢ.
Nʼụzọ dị otu a ka ọ ga-esi kpeziere anyị na Chineke site nʼobe ya, wetakwa nʼisi ngwụcha, iro dị nʼetiti ha abụọ.
17 ᎠᎴ ᎤᎷᏤᎢ ᎠᎴ ᎤᎵᏥᏙᏁ ᎢᏥᏃᎯᎮᎴ ᎾᏍᎩ ᏙᎯ ᎢᏥᏩᏛᎡᎯ ᎨᏒᎢ, ᏂᎯ ᎢᏅ ᎢᏣᏛᎿᎭᏕᎩ, ᎠᎴ ᎾᏍᎩ Ꮎ ᎾᎥ ᎢᏳᎾᏛᎿᎭᏕᎩ.
Ya mere, ọ bịara kwusaa udo nye unu ndị nọ ebe dị anya na unu ndị nọ nso,
18 ᎾᏍᎩᏰᏃ ᎢᏳᏩᏂᏌᏛ ᎠᏴ ᎢᏧᎳ, ᏌᏉ ᎠᏓᏅᏙ ᎬᏗ, ᎠᎦᏴᎵᎨ ᏫᎦᏰᏗᎷᏤᏗ ᏄᎵᏍᏔᏅ.
Nʼihi na anyị abụọ sitere nʼaka ya nweta nnabata anyị ịbịa nʼihu Nna site nʼotu Mmụọ ahụ.
19 ᎾᏍᎩᏃ ᏥᏄᏍᏗ ᎥᏝ ᎿᎭᏉ ᏁᏣᏓᎴ, ᎠᎴ ᎢᏤᏙᎯᏉ ᏱᎩ, ᎤᎾᏓᏅᏘᏍᎩᏂ ᎢᏧᎳᎭ ᎢᏤᎯ, ᎤᏁᎳᏅᎯ ᎦᏓᏘᎾᎥ ᎢᏖᎳ;
Matakwanụ ugbu a na unu abụkwaghị ndị mba ọzọ na ndị ọbịa. Unu esorola ndị nsọ bụrụ diala na ndị so nʼezinaụlọ Chineke,
20 ᎡᏣᏁᏍᎨᎲᎯ ᎨᏒ ᎡᏥᏝᏅᎯ ᎨᏥᏅᏏᏛ ᎠᎴ ᎠᎾᏙᎴᎰᏍᎩ ᎡᏥᎫᏍᏛᏔᏅᎯ, ᏥᏌ ᎦᎶᏁᏛ ᎤᏩᏒ ᏄᎬᏫᏳᏒ ᎤᏅᏏᏴ Ꭰ’ᏅᎯ ᏅᏯ ᎢᏳᎵᏍᏔᏅᎯ;
nke a rụkwasara nʼelu ntọala nke ndị ozi na ndị amụma, nke Kraịst Jisọs nʼonwe ya bụ nkume isi ntọala ya.
21 ᎾᎿᎭᏂ ᏂᎬ ᎠᏓᏁᎸ ᎣᏍᏛ ᏗᏓᏙᎵᎩ ᎢᎬᏁᎸᎯ, ᎠᏛᏍᎪᎢ ᎦᎸᏉᏗ ᎠᏓᏁᎸ ᏂᎦᎵᏍᏗᏍᎪ ᎤᎬᏫᏳᎯᏱ ᎠᏝᏅᎯ;
Ọ bụkwa nʼime ya ka a na-ejikọta ụlọ ahụ niile nke ọma, na-aba ụba, too bụrụ ụlọnsọ, nʼime Onyenwe anyị.
22 ᎾᎿᎭᏂ ᎾᏍᏉ ᏂᎯ ᏤᏣᏜᏓᏍᏔᏅᎯ ᎡᏣᏁᏍᎨᎲᎯ ᎡᏥᏝᏅᎯ, ᎤᏁᎳᏅᎯ ᎤᏁᎳᏗᏍᏗᏱ ᎠᏓᏅᏙ ᎬᏗᏍᎬᎢ.
Onye a na-ewukọkwa unu onwe unu nʼotu nʼime ya, ka unu niile bụrụ ebe obibi Chineke nʼime Mmụọ.

< ᏉᎳ ᎡᏈᏌ ᎠᏁᎯ ᏧᏬᏪᎳᏁᎸᎯ 2 >