< ᎪᎵᏂᏗᏱ ᎠᏁᎯ ᏔᎵᏁ ᎨᎪᏪᎳᏁᎸᎯ 11 >

1 ᏲᎯᏉ ᎤᏍᏗᎩᏛ ᎤᏁᎳᎩ ᎨᏍᎩᏰᎵᏎᏗ ᏱᎩ ᎠᎩᏁᎫ ᎨᏒᎢ; ᎠᎴ ᎤᏙᎯᏳᎯ ᎤᏁᎳᎩ ᏍᎩᏰᎵᏏ.
Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na unu ga-anagide m ka m kwuo okwu ndị a dị ka onye nzuzu. Biko nagidenụ m.
2 ᏕᏨᏰᎷᎦᏰᏃ ᎤᏁᎳᏅᎯ ᏗᎬᏩᏓ ᏂᎸᎢᏍᏗ ᎠᏛᏳᎨᏗ ᎨᏒ ᎬᏗᎭ; ᏌᏉᏰᏃ ᎠᏍᎦᏯ ᏗᏣᏨᏍᏗᏱ ᏂᏨᏴᏁᎸ, ᎾᏍᎩ ᎤᎵᏏᎾᎯᏍᏗ ᎠᏛ ᎢᎦᎦᏛ ᎦᎶᏁᏛ ᏫᏗᏨᏲᎯᏎᏗᏱ.
Ekworo m nwere nʼebe unu nọ bụ ekworo nke Chineke. Ekwere m nkwa iwere unu nye otu di, ya bụ Kraịst, ka m nwe ike chee unu nʼihu ya dịka nwaagbọghọ dị ọcha nke na-amaghị nwoke.
3 ᎠᏎᏃ ᏥᎾᏰᏍᎦ, ᎾᏍᎩᏯ Ꮎ ᎢᎾᏛ ᏧᎶᏄᎮᎴ ᎢᏫ ᎠᏏᎾᏌᏅ ᏥᎬᏗᏍᎨᎢ, ᎾᏍᎩᏯ ᏕᏣᏓᏅᏛ ᏱᏓᎪᎸᎾ ᏗᏥᏲᎯᏍᏗᏱ ᏱᏂᎬᎦ ᏄᏠᎾᏍᏛᎾ ᎨᏒ ᎦᎶᏁᏛ ᎤᏤᎵᎦ.
Ma ana m atụ egwu, na dịka agwọ jiri aghụghọ ghọgbuo Iiv, ndị nrafu ga-eji aghụghọ duhie unu, mee ka unu kwụsị iji obi dị ọcha na uche ziri ezi jeere Kraịst ozi.
4 ᎩᎶᏰᏃ ᎢᏥᎷᏤᎯ ᏅᏩᏓᎴ ᏥᏌ ᎠᎵᏥᏙᎲᏍᎨᏍᏗ, ᎾᏍᎩ Ꮎ ᎠᏴ ᎣᏣᎵᏥᏙᏅᎯ ᏂᎨᏒᎾ, ᎢᏳ ᎠᎴ ᏅᏩᏓᎴ ᎠᏓᏅᏙ ᏙᏣᏓᏂᎸᏨᎭ, ᎾᏍᎩ Ꮎ ᏗᏣᏓᏂᎸᏨᎯ ᏂᎨᏒᎾ, ᎠᎴ ᏅᏩᏓᎴ ᎣᏍᏛ ᎧᏃᎮᏛ, ᎾᏍᎩ Ꮎ ᏗᏣᏓᏂᎸᏨᎯ ᏂᎨᏒᎾ, ᎣᏏᏳᏉ ᎤᏁᎳᎩ ᏱᏤᎵᏒ.
Nʼihi na unu gaara anara onye ọzọ bịakwutere unu na-ekwusa Jisọs ọzọ nke na-abụghị nke anyị kwusara, unu gaara anarakwa ike nke mmụọ ọzọ dị iche na-abụghị ike nke Mmụọ Nsọ ahụ unu natara, unu gaara ekwenyekwa na nkuzi ọzọ dị iche, na-abụghị oziọma ahụ nke unu natara.
5 ᎦᏓᏅᏖᏍᎬᏰᏃ ᎥᏝ ᎤᏍᏗ ᎤᏅ ᎡᏍᎦ ᏱᎦᏥᏲᎠᏍᎦ ᏄᏂᎬᏫᏳᏒ ᎨᏥᏅᏏᏛ ᎨᏒᎢ.
Ma echeghị m na ọ dị ụzọ ọbụla ndị ozi a maara aha ha si kara m mma.
6 ᎤᏁᎳᎩ ᏅᏇᏲᏅᎾ ᏱᎩ ᎠᎩᏬᏂᎯᏍᏗᏱ, ᎠᏎᏃ ᎥᏝ ᎾᏍᎩ ᏱᏄᏍᏗ ᏥᎦᏔᎾᎥᎢ; ᏂᎦᎥᏉᏍᎩᏂ ᏃᎦᏍᏛ ᎬᏂᎨᏒ ᏃᎦᎵᏍᏔᏅ ᎾᏂᎥ ᎠᏂᎦᏔᎲ ᏂᎯ ᎢᏤᎲᎢ.
Ọ bụrụ na m abụghị onye ọka okwu, abụ m onye ọka mmụta. Anyị akọwarala unu nke a ọtụtụ mgbe nʼụzọ dị iche iche nʼihe niile.
7 ᏥᎪ ᏥᏍᎦᏅᎩ ᎡᎳᏗ ᏥᎾᏆᏓᏛᏁᎸ, ᏂᎯ ᎡᏥᏌᎳᏙᏗᏱ, ᎾᏍᎩ ᏂᏗᏨᎬᏩᎶᏓᏁᎸᎾ ᏥᎩ ᎣᏍᏛ ᎧᏃᎮᏛ ᎤᏁᎳᏅᎯ ᎤᏤᎵᎦ ᎢᏨᏯᎵᏥᏙᏁᎸᎢ?
Ọ ga-abụ na-emere m ihe ọjọọ mgbe m wedara onwe m ala ka e welie unu elu, nʼihi nʼanaghị m unu ihe ọbụla mgbe m na-ekwusara unu oziọma Chineke?
8 ᏕᎦᏥᎾᏌᏅ ᏅᏩᎾᏓᎴ ᏧᎾᏁᎶᏗ ᏚᎾᏓᏡᏩᏗᏒᎢ, ᏥᎩᏍᎬᎩ ᎬᏆᎫᏴᎡᎲᎢ, ᏂᎯ ᎪᎱᏍᏗ ᎢᏨᏯᏛᏁᏗᏱ.
Ọ bụ nzukọ nọ nʼebe ọzọ nyeere m aka mgbe m na-arụ ọrụ nʼetiti unu. Ọ bụ site nʼaka ha ka m ji nata nkwado, dịka ụgwọ ọrụ m, ka m nwee ike inyere unu aka.
9 ᎠᎴ ᎾᎯᏳ ᏥᏨᏰᎳᏗᏙᎲᎩ ᎠᎴ ᎠᏆᏚᎸᎲᎥᎦ, ᎥᏝ ᎩᎶ ᏯᏆᎫᏱᏍᎨᎢ; ᎾᏍᎩᏰᏃ ᎠᎩᏂᎬᏎᎲᎢ, ᎣᏣᎵᏅᏟ ᎹᏏᏙᏂ ᏅᏓᏳᏂᎶᏒᎯ ᎬᎩᏁᎲᎩ; ᎠᎴ ᏂᎦᎥᏉ ᎠᏆᏟᏂᎬᏁᎸ ᎢᏨᏐᏈᎸᏗᏱ ᏂᎨᏒᎾ, ᎠᎴ ᎠᏏᏉ ᎾᏍᎩ ᏂᎦᏛᏁᎮᏍᏗ.
Ma mgbe m nọ nʼetiti unu abụghị m ibu arọ nye onye ọbụla nʼoge mkpa m. Nʼihi na ụmụnna si Masidonia wetaara m ihe niile na-akpa m mkpa. Ebe ọ bụ na m gbalịrị debe onwe m, ka m ghara ịbụ ibu arọ nye unu nʼụzọ ọbụla nʼoge gara aga, agaghị m abụkwa ibu arọ nye unu nʼoge dị nʼihu.
10 ᎾᏍᎩᏯ ᎦᎶᏁᏛ ᎤᏤᎵ ᎦᏰᎪᎩ ᏂᎨᏒᎾ ᎨᏒ ᏣᎩᏯᎠ, ᎥᏝ ᎥᎩᏲᎯᏍᏓᏁᏗ ᏱᎨᏎᏍᏗ ᎯᎠ ᎾᏍᎩ ᎦᏢᏈᏍᎬ ᎡᎧᏯ ᏂᎬᎾᏛᎢ.
Ebe eziokwu nke Kraịst dị nʼime m, ịnya isi m nke a agaghị akwụsị na mpaghara Akaịa niile.
11 ᎦᏙᏃ? ᏥᎪ ᏂᏨᎨᏳᏒᎾ ᎨᏒ ᎢᏳᏍᏗ? ᎤᏁᎳᏅᎯ ᎠᎦᏔᎭ.
Nʼihi gịnị? Ọ bụ nʼihi na m ahụghị unu nʼanya? Chineke maara na m hụrụ unu nʼanya.
12 ᎠᏎᏃ ᏂᎦᏛᏁᎲ ᎾᏍᎩ ᏂᎦᎦᏛᏁᎮᏍᏗ, ᎾᏍᎩ ᎦᏥᏲᏍᏙᏓᏁᏗᏱ ᎤᎾᏜᏓᏅᏓᏕᏗᏱ ᎾᏍᎩ Ꮎ ᏧᎾᏚᎵᎭ ᎤᎾᏜᏓᏅᏓᏕᏗᏱ; ᎾᏍᎩ ᎾᎿᎭᎠᎾᏢᏈᏍᎬ ᎾᏍᎩ ᎠᏴ ᏃᎦᏍᏛ ᎾᏍᎩᏯ ᏄᎾᏍᏛ ᎬᏂᎨᏒ ᏱᏂᎦᎵᏍᏓ.
Ma aga m aga nʼihu na-arụ ọrụ m na-achọghị ka unu nyere m aka nʼụzọ ọbụla ka m si otu a mee ka ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị ozi ghara ịnya isi kwuokwa na ha na-arụ ọrụ dịka anyị si arụ ọrụ anyị nʼetiti unu.
13 ᎯᎠᏰᏃ ᎾᏍᎩ Ꮎ ᎤᎾᏠᎾᏍᎩ ᎨᏥᏅᏏᏛ, ᎤᎾᏓᎵᏓᏍᏗ ᏧᏂᎸᏫᏍᏓᏁᎯ, ᎦᎶᏁᏛ ᏧᏤᎵ ᎨᏥᏅᏏᏛ ᎠᎾᏤᎸᏍᎩ.
Nʼihi na ndị dị otu a bụ ndị ozi ụgha, ndị ọrụ aghụghọ, ndị na-eme onwe ha ka ha bụ ndị ozi Kraịst.
14 ᎥᏝ ᎠᎴ ᏳᏍᏆᏂᎪᏗ; ᏎᏓᏂᏰᏃ ᎤᏩᏒ ᏗᎧᎿᎭᏩᏗᏙᎯ ᎢᎦ-ᎦᏛ ᎡᎯ ᎠᏤᎸᏍᎪᎢ.
Ma omume ha adịghị eju m anya, nʼihi na ekwensu gbanwere onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè.
15 ᎾᏍᎩ ᎢᏳᏍᏗ ᎥᏝ ᎤᏣᏘ ᎤᏍᏆᏂᎪᏗᏳ ᏱᎩ ᎾᏍᏉ ᎾᏍᎩ ᏧᏅᏏᏓᏍᏗ ᏚᏳᎪᏛ ᎨᏒ ᎨᏥᏅᏏᏓᏍᏗ ᏯᎾᏤᎸᏍᎦ; ᎾᏍᎩ ᎤᎵᏍᏆᎸᏗ ᎢᏳᎾᎵᏍᏓᏁᏗ ᎨᏒ ᎾᏍᎩᏯ ᏚᏂᎸᏫᏍᏓᏁᎸ ᎨᏎᏍᏗ.
Ya mere, ọ bụghị ihe iju anya ma ọ bụrụ na ndị na-ejere ya ozi emee onwe ha dịka ndị na-eje ozi ụzọ ezi omume. Ma nʼọgwụgwụ oge, ha ga-anata ụgwọ dịka ọrụ ha si dị.
16 ᏔᎵᏁ ᎯᎠ ᏂᏥᏪᎭ, ᏞᏍᏗ ᎩᎶ ᎤᏁᎫ ᏯᏇᎵᏎᎮᏍᏗ; ᎢᏳ ᎠᏗᎾ ᎾᏍᎩ ᏄᏍᏕᏍᏗ, ᎠᏎ ᎠᎩᏁᎫ ᎾᏍᎩᏯ ᏗᏍᎩᏯᏓᏂᎸᎩ, ᎾᏍᎩ ᎠᏴ ᎤᏍᏗ ᎠᏆᏢᏈᏍᏗᏱ.
Dịka m kwuru na mbụ, ka onye ọbụla ghara iche na m bụ onye na-enweghị uche. Ọ bụrụkwarị na unu na-eche ụdị echiche a, biko naranụ m dịka onye na-enweghị uche, ka m nwee ike ịnya isi nke nta dịka ndị ọzọ si eme.
17 ᎾᏍᎩ ᎯᎠ ᏂᏥᏪᏍᎬ ᏥᏁᎬ ᎥᏝ ᎤᎬᏫᏳᎯ ᎢᏳᏪᏍᏗ ᏱᏥᏁᎦ, ᎠᎩᏁᎫᏍᎩᏂ ᎾᏍᎩᏯ ᏥᏁᎦ, ᎯᎠ ᎾᏍᎩ ᏂᏥᎾᏰᏍᎬᎾ ᎨᏒ ᏥᎬᏗᎭ ᏥᎦᏢᏆᏍᎦ.
Ma nʼihe m dabeere na-anya isi, adịghị m ekwu okwu dịka Onyenwe anyị ga-ekwu, maọbụ dịka onye na-enweghị uche.
18 ᎾᏍᎩᏃ ᏧᏂᏣᏔ ᏣᎾᏢᏈᏍᎦ ᎤᏇᏓᎵ ᎬᏙᏗ ᎨᏒᎢ, ᎠᏴ ᎾᏍᏉ ᏓᎦᏢᏆᏏ.
Ebe ọtụtụ mmadụ na-anya isi banyere ihe ha bụ nʼụzọ ụwa si eme. Mụ onwe m ga-anyakwa isi.
19 ᎤᏂᏁᎫᏰᏃ ᎤᎾᏁᎳᎩ ᏙᏤᎵᏎᎭ ᎣᏏᏳ ᎢᏥᏰᎸᎭ, ᏂᎯ ᎢᏥᎦᏔᎾᎢ ᎨᏒ ᎢᏳᏍᏗ.
Unu were obi ụtọ na-anagide ndị na-enweghị uche, ebe unu onwe unu nwere uche.
20 ᎤᏁᎳᎩᏰᏃ ᎢᏤᎵᏍᎪ ᎢᏳᏃ ᎩᎶ ᏱᏗᏥᎾᏢᏅ, ᎢᏳᏃ ᎩᎶ ᎠᏒᎭ ᏱᏂᏨᏁᎸ, ᎢᏳᏃ ᎩᎶ [ ᎪᎱᏍᏗ ᎢᏥᎲ ] ᏱᏥᎩᎡᎸ, ᎢᏳᏃ ᎩᎶ ᎤᏩᏒ ᏳᏓᎵᏌᎳᏓᏅ, ᎢᏳᏃ ᎩᎶ ᏕᏣᎧᏛ ᏱᏨᏂᎸ.
Unu na-anagide ya ma ọ bụrụ na onye ọbụla eme unu ndị ohu ha, maọbụ jiri anya ike nakọrọ unu ihe unu nwere, maọbụ ghọgbuo unu, maọbụ bulie onwe ya elu dịka ha karịrị unu, maọbụ maa unu uraa nʼihu.
21 ᎤᏕᎰᎯᏍᏗ ᎨᏒ ᎤᎬᏩᎵ ᏥᏁᎦ, ᎾᏍᎩ ᏦᏥᏩᎾᎦᎳ ᎪᎪᏎᎲᎢ. ᎾᎿᎭᏍᎩᏂᏃᏅ ᎩᎶ ᎬᏩᎾᏰᎯᏍᏗ ᏂᎨᏒᎾ ᎨᏒ ( ᎤᏁᎫ ᎤᏁᎢᏍᏗ ᏥᏁᎦ, ) ᎠᏴ ᎾᏍᏉ ᏂᏥᎾᏰᏍᎬᎾ.
Nʼezie, ọ bụ ihere m, ịnabata na anyị bụ ndị na-adịghị ike nʼezie nye nke a. Ọ bụrụ na onye ọbụla anwaa anwaa nyaa isi nʼihe ọbụla (ana m ekwu dịka onye nʼenweghị uche), mụ onwe m ga-anyakwa isi.
22 ᏥᎪ ᎢᎾᏈᎷ ᎾᏍᎩ? ᎠᏴ ᎾᏍᏉ. ᏥᎪ ᎠᏂᎢᏏᎵ? ᎠᏴ ᎾᏍᏉ. ᎡᏆᎭᎻᏍᎪ ᏧᏁᏢᏔᏅᏛ ᎾᏍᎩ? ᎠᏴ ᎾᏍᏉ.
Ha bụ ndị Hibru? Mụ onwe m bụkwa ya. Ha bụ ndị Izrel? Mụ onwe m bụkwa ya. Ha bụ ndị agbụrụ Ebraham? Mụ onwe m bụkwa.
23 ᏥᎪ ᎦᎶᏁᏛ ᏧᏅᏏᏓᏍᏗ ᎾᏍᎩ? ( ᎤᏁᎫ ᎤᏁᎢᏍᏗ ᏥᏁᎦ, ) ᎠᏴ ᎤᏟᎢ; ᏓᎩᎸᏫᏍᏓᏁᎲ ᎤᏟ ᎢᎦᎢ; ᎥᎩᎵᎥᏂᎸ ᎤᏟᎯᏳ ᎢᎦᎢ; ᏗᎦᏍᏚᏗᏱ ᎥᎩᏴᏔᏅᎢ ᎤᏟ ᎢᎦᎢ; ᎠᎩᏲᎱᏏᏕᎾ ᎨᏒ ᏯᏃᏉ;
Ha bụ ndị na-ejere Kraịst ozi? (Ana m ekwu dịka onye anya na-adịghị mma.) Ma mụ onwe m ejela ozi karịa. Adọgbuola m onwe m nʼọrụ karịa ha niile. Etinyela m nʼụlọ mkpọrọ ọtụtụ mgbe, tinyere ọtụtụ ihe otiti, mgbe mgbe anọọla m nʼọnụ ọnwụ.
24 ᎠᏂᏧᏏ ᎯᏍᎩ ᏂᎬᎩᎵᎥᏂᎸᎩ ᎢᏳᏍᏗᎭ ᏌᏉ ᎦᎷᎶᎩ ᏅᎦᏍᎪᎯ ᎢᎬᏋᏂᏍᏗᏱ;
Ugboro ise ka ndị Juu pịara m ọnụ ụtarị iri anọ e wepụrụ otu.
25 ᏦᎢ ᎢᏳᏩᎫᏗ ᎦᎾᏍᏓ ᏕᎬᎩᎵᎥᏂᏍᏔᏅᎩ; ᏌᏉ ᏅᏯ ᏂᏕᎬᏋᏂᏍᏔᏅᎩ; ᏦᎢ ᎢᏳᏩᎫᏗ ᏥᏳ ᎠᏆᏦᏛ ᎤᏲᏨᎩ; ᎤᎵᏨᏓᏆᏛ ᎠᎴ ᎤᏙᏓᏆᏛ ᎠᏍᏛᎬ ᎾᏆᏛᏅᎩ;
E jirila okporo igwe tie m ugboro atọ. Atụrụ m nkume otu ugboro. Ugboro atọ ka ụgbọ mmiri m nọ nʼime ya kpuru nʼoke osimiri. Anọọla m otu abalị na ụbọchị so ya nʼelu oke osimiri ebe mmiri na-ebugharị m.
26 ᎨᏙᎲ ᏯᏃᏉ; ᎡᏉᏂ ᏕᎨᏴ ᎤᎾᏰᎯᏍᏗᏳ ᎨᏒᎢ; ᏗᎾᏓᎾᏌᎲᏍᎩ ᎤᏂᎾᏰᎯᏍᏗᏳ ᎨᏒᎢ; ᏗᏆᏤᎵ ᏴᏫ ᎤᏂᎾᏰᎯᏍᏗᏳ ᎨᏒᎢ; ᏧᎾᏓᎴᏅᏛ ᏴᏫ ᎤᏂᎾᏰᎯᏍᏗᏳ ᎨᏒᎢ; ᎦᏚᎲ ᎤᎾᏰᎯᏍᏗᏳ ᎨᏒᎢ; ᎢᎾᎨ ᎨᏒ ᎤᎾᏰᎯᏍᏗᏳ ᎨᏒᎢ; ᎠᎺᏉᎯ ᎤᎾᏰᎯᏍᏗᏳ ᎨᏒᎢ; ᎤᎾᏠᎾᏍᏗ ᎣᏣᎵᏅᏟ ᎤᏂᎾᏰᎯᏍᏗᏳ ᎨᏒᎢ;
Ejeela m ọtụtụ ogologo ije nke ọtụtụ ihe ize ndụ dị nʼime ya. Nʼize ndụ site nʼosimiri, ize ndụ site na ndị na-apụnarị mmadụ ihe nʼike, ize ndụ site nʼaka ndị obodo nke aka m. Ọtụtụ mgbe ka m zere ndụ site nʼaka ndị mba ọzọ, nʼime obodo ukwu, nʼọzara ma nʼoke osimiri; na nʼaka ndị kpọrọ onwe ha ụmụnna m, ma ha bụ ndị ụgha.
27 ᏓᎩᏯᏪᏥᏙᎸ ᎠᎴ ᎡᎯᏍᏗ ᎾᏆᎵᏍᏓᏁᎸᎢ; ᏯᏃᎩᏳ ᏂᏥᎸᏍᎬᎾ ᎨᏒᎢ; ᎠᎪᏄ ᎠᎩᏲᏏᏍᎬᎢ ᎠᎴ ᎠᎩᏔᏕᎩᏍᎬᎢ; ᏯᏃᎩᏳ ᎠᎹᏟ ᎬᏍᎬᎢ; ᎤᏴᏢ ᎠᎴ ᎠᎩᏰᎸᎭ ᎨᏒᎢ.
Adọgbuola m onwe m nʼọrụ, anọọla m nʼọnọdụ ịhụju anya na ịmụ anya ọtụtụ abalị. Ọtụtụ mgbe ana m anọ agụụ na-erighị ihe ọbụla, maọbụ ịṅụ ihe ọbụla. Anọọla m ọtụtụ mgbe nʼoge oyi na-ama jijiji nʼihi enweghị uwe dị mma m ji achụ oyi.
28 ᏂᏓᏠᏯᏍᏛᎾ ᏧᏓᎴᏅᏛ, ᎾᏍᎩ ᏂᏚᎩᏨᏂᏒ ᏣᎩᎷᏤᎭ, ᎾᏍᎩ Ꮎ ᏗᏆᎦᏌᏯᏍᏙᏗᏱ ᏂᎦᏛ ᏧᎾᏁᎶᏗ ᏚᎾᏓᏡᏩᏗᏒᎢ.
Ma e wezuga ihe ndị a niile, ana m anọ nʼechiche mgbe niile banyere otu ihe niile si aga nʼime nzukọ.
29 ᎦᎪ ᎠᏩᎾᎦᎶᎢ, ᎠᏴᏃ ᏂᏥᏩᏂᎦᎸᎾ ᎨᏐᎢ? ᎦᎪ ᏚᏬᏕᎯᎰᎢ, ᎠᏴᏃ ᏂᏥᎴᏴᏍᎬᎾ ᎨᏐᎢ?
Onye bụ onye ahụ na-adịghị ike nke m na-adịghị eso ya kere oke na-adịghị ike ya? Onye ka e dubara na mmehie nke ọnọdụ ya na-adịghị emetụ m nʼobi?
30 ᎢᏳᏃ ᎠᏎ ᎠᏆᏢᏈᏍᏗ ᎨᏎᏍᏗ, ᏥᏩᎾᎦᎵᏳ ᎨᏒ ᎤᎬᏩᎵ ᏓᎦᏢᏆᏏ.
Kama ọ bụrụ na o kwesiri ka m nyaa isi aga m anya isi banyere ihe ndị ahụ na-egosi adịghị ike m.
31 ᎤᎬᏫᏳᎯ ᎢᎦᏤᎵ ᏥᏌ ᎦᎶᏁᏛ ᎤᏤᎵ ᎤᏁᎳᏅᎯ ᎠᎴ ᎤᏙᏓ, ᎾᏍᎩ ᏂᎪᎯᎸ ᎦᎸᏉᏙᏗ ᏥᎩ, ᎠᎦᏔᎭ ᏂᎦᏥᎪᎥᏍᎬᎾ ᎨᏒᎢ. (aiōn g165)
Chineke, na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs, onye e kwesiri ito aha ya ruo mgbe ebighị ebi, maara na ihe ndị a niile m na-ekwu bụ eziokwu. (aiōn g165)
32 ᏕᎹᏍᎦ ᏫᎨᏙᎲ ᏄᎬᏫᏳᏎᏕᎩ ᎡᎵᏓ ᎤᎬᏫᏳᎯ ᎤᏪᎧᏅᎯ, ᎠᏯᏫᏍᎬᎩ ᎠᏂᏕᎹᏍᎦ ᎤᏂᏚᎲᎢ ᎾᏍᎩ ᎤᏚᎵᏍᎬ ᎠᎩᏂᏴᏗᏱ;
Nʼobodo Damaskọs, onye ọchịchị ala ahụ nke eze obodo ahụ a na-akpọ Aretas họpụtara, ndị na-eche obodo Damaskọs nche ka ha jide m.
33 ᎠᏦᎳᏅᏃ ᏓᎬᎩᏄᎪᏫᏒᎩ ᏔᎷᏣᎩᎯ ᎬᏆᏦᏗ ᎬᏆᏠᎥᏔᏅᎩ ᎠᏐᏳᎶᏗ, ᎠᎴ ᏥᏯᏗᏫᏎᎸᎩ.
Ma e tinyere m nʼime nkata, site nʼoghere dị na mgbidi gbara obodo ahụ gburugburu wedata m, m gbanarị ya.

< ᎪᎵᏂᏗᏱ ᎠᏁᎯ ᏔᎵᏁ ᎨᎪᏪᎳᏁᎸᎯ 11 >