< زَكَريَّا 10 >

اُطْلُبُوا مِنَ ٱلرَّبِّ ٱلْمَطَرَ فِي أَوَانِ ٱلْمَطَرِ ٱلْمُتَأَخِّرِ، فَيَصْنَعَ ٱلرَّبُّ بُرُوقًا وَيُعْطِيَهُمْ مَطَرَ ٱلْوَبْلِ. لِكُلِّ إِنْسَانٍ عُشْبًا فِي ٱلْحَقْلِ. ١ 1
Rịọọnụ Onyenwe anyị mmiri ozuzo nʼoge mmiri ozuzo nke ikpeazụ, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-ezite oke amụma mmiri. Ọ bụ ya na-enye ụmụ mmadụ mmiri ozuzo, na-enyekwa mmadụ niile ihe ọkụkụ nke ubi.
لِأَنَّ ٱلتَّرَافِيمَ قَدْ تَكَلَّمُوا بِٱلْبَاطِلِ، وَٱلْعَرَّافُونَ رَأَوْا ٱلْكَذِبَ وَأَخْبَرُوا بِأَحْلَامِ كَذِبٍ. يُعَزُّونَ بِٱلْبَاطِلِ. لِذَلِكَ رَحَلُوا كَغَنَمٍ. ذَلُّوا إِذْ لَيْسَ رَاعٍ. ٢ 2
Arụsị niile na-ekwu okwu aghụghọ, ndị na-agba aja nʼahụ ọhụ bụ ụgha, ndị ha na-arọ nrọ, na-akọwakwa nrọ ụgha, okwu nkasiobi nke ihe na-adịghị nʼime ya ka ha na-enye. Ya mere, ndị mmadụ na-akpagharị dịka atụrụ a na-akpagbu ha nʼihi enweghị onye ọzụzụ atụrụ.
«عَلَى ٱلرُّعَاةِ ٱشْتَعَلَ غَضَبِي فَعَاقَبْتُ ٱلْأَعْتِدَةَ، لِأَنَّ رَبَّ ٱلْجُنُودِ قَدْ تَعَهَّدَ قَطِيعَهُ بَيْتَ يَهُوذَا، وَجَعَلَهُمْ كَفَرَسِ جَلَالِهِ فِي ٱلْقِتَالِ. ٣ 3
“Iwe m na-ere ọkụ megide ndị ọzụzụ atụrụ, aga m atakwa ndị ndu niile ahụhụ; nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-elekọta igwe anụ ụlọ ya, ya bụ ndị Juda, ọ ga-eme ka ha dịrị ka ịnyịnya dị ebube nʼagha.
مِنْهُ ٱلزَّاوِيَةُ. مِنْهُ ٱلْوَتَدُ. مِنْهُ قَوْسُ ٱلْقِتَالِ. مِنْهُ يَخْرُجُ كُلُّ ظَالِمٍ جَمِيعًا. ٤ 4
A ga-esi na Juda nweta nkume bụ ide ji ụlọ, a ga-esi na ha nweta ǹtu ụlọ ikwu, a ga-esi na ha nweta ụta a kwadoro maka agha, sitekwa na ha nweta ndị ndu dị iche iche.
وَيَكُونُونَ كَٱلْجَبَابِرَةِ ٱلدَّائِسِينَ طِينَ ٱلْأَسْوَاقِ فِي ٱلْقِتَالِ، وَيُحَارِبُونَ لِأَنَّ ٱلرَّبَّ مَعَهُمْ، وَٱلرَّاكِبُونَ ٱلْخَيْلَ يَخْزَوْنَ. ٥ 5
Ha niile ga-ejikọta onwe ha ọnụ, dịka ndị bụ dike nʼagha, ha ga-azọda ndị iro ha nʼapịtị nke okporoụzọ niile. Nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere ha, ha ga-alụgbukwa ndị iro niile na-agba ịnyịnya.
وَأُقَوِّي بَيْتَ يَهُوذَا، وَأُخَلِّصُ بَيْتَ يُوسُفَ وَأُرَجِّعُهُمْ، لِأَنِّي قَدْ رَحِمْتُهُمْ. وَيَكُونُونَ كَأَنِّي لَمْ أَرْفُضْهُمْ، لِأَنِّي أَنَا ٱلرَّبُّ إِلَهُهُمْ فَأُجِيبُهُمْ. ٦ 6
“Aga m eme ka ụlọ Juda dị ike, zọpụtakwa ụlọ Josef. Aga m eme ka ha lọghachita, nʼihi na aga m egosi ha obi ebere. Ha ga-adị ka ndị m na-ajụghị mgbe ọbụla, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha, aga m azakwa arịrịọ ha.
وَيَكُونُ أَفْرَايِمُ كَجَبَّارٍ، وَيَفْرَحُ قَلْبُهُمْ كَأَنَّهُ بِٱلْخَمْرِ، وَيَنْظُرُ بَنُوهُمْ فَيَفْرَحُونَ وَيَبْتَهِجُ قَلْبُهُمْ بِٱلرَّبِّ. ٧ 7
Ndị Ifrem ga-aghọ ndị dị ike nʼagha, ha ga-enwe ọṅụ dịka ndị na-aṅụ mmanya. Ụmụ ha ga-ahụ ya ṅụrịakwa ọṅụ, ha ga-ejikwa obi ha niile ṅụrịa ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.
أَصْفِرُ لَهُمْ وَأَجْمَعُهُمْ لِأَنِّي قَدْ فَدَيْتُهُمْ، وَيَكْثُرُونَ كَمَا كَثُرُوا. ٨ 8
Mgbe ahụ, aga m akpọ ha oku, chịkọtaa ha. Nʼezie, aga m agbapụta ha, ha ga-adịkwa ukwuu dịka ha dị na mbụ.
وَأَزْرَعُهُمْ بَيْنَ ٱلشُّعُوبِ فَيَذْكُرُونَنِي فِي ٱلْأَرَاضِي ٱلْبَعِيدَةِ، وَيَحْيَوْنَ مَعَ بَنِيهِمْ وَيَرْجِعُونَ. ٩ 9
A sịkwarị na m chụsara ha nʼetiti ndị dị iche iche, ma ha ga-echeta m site nʼala niile ahụ dị anya. Ha na ụmụ ha ga-adịkwa ndụ; ha ga-alọtakwa.
وَأُرْجِعُهُمْ مِنْ أَرْضِ مِصْرَ، وَأَجْمَعُهُمْ مِنْ أَشُّورَ، وَآتِي بِهِمْ إِلَى أَرْضِ جِلْعَادَ وَلُبْنَانَ، وَلَا يُوجَدُ لَهُمْ مَكَانٌ. ١٠ 10
Aga m esi nʼala Ijipt kpọlata ha, sitekwa nʼAsịrịa chịkọtaa ha. Aga m akpọta ha na Gilead na Lebanọn. Ha agaghị enwekwa ebe ga-ezuru ha niile.
وَيَعْبُرُ فِي بَحْرِ ٱلضِّيقِ، وَيَضْرِبُ ٱللُّجَجَ فِي ٱلْبَحْرِ، وَتَجِفُّ كُلُّ أَعْمَاقِ ٱلنَّهْرِ، وَتُخْفَضُ كِبْرِيَاءُ أَشُّورَ، وَيَزُولُ قَضِيبُ مِصْرَ. ١١ 11
Ha ga-esi nʼosimiri nsogbu gafee. A ga-emekwa ka mmali elu nke osimiri dajụọ. Ebe obibi niile nke osimiri Naịl ga-atakọrọkwa. A ga-egbuda mpako niile nke Asịrịa, wezugakwa mkpara ọchịchị nke ndị Ijipt.
وَأُقَوِّيهِمْ بِٱلرَّبِّ، فَيَسْلُكُونَ بِٱسْمِهِ، يَقُولُ ٱلرَّبُّ». ١٢ 12
Aga m eme ka ha dị ike nʼime Onyenwe anyị, ọ bụkwa nʼaha ya ka ha ga na-ejegharị nʼudo.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

< زَكَريَّا 10 >