< اَلْمَزَامِيرُ 46 >

لِإِمَامِ ٱلْمُغَنِّينَ. لِبَنِي قُورَحَ. عَلَى «ٱلْجَوَابِ». تَرْنِيمَةٌ ٱللهُ لَنَا مَلْجَأٌ وَقُوَّةٌ. عَوْنًا فِي ٱلضِّيْقَاتِ وُجِدَ شَدِيدًا. ١ 1
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Nʼusoro olu abụ alamot. Otu Abụ. Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị, onye inyeaka anyị ka ọ bụ nʼoge nsogbu.
لِذَلِكَ لَا نَخْشَى وَلَوْ تَزَحْزَحَتِ ٱلْأَرْضُ، وَلَوِ ٱنْقَلَبَتِ ٱلْجِبَالُ إِلَى قَلْبِ ٱلْبِحَارِ. ٢ 2
Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, ọ bụladị mgbe ụwa niile na-emebi, maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri.
تَعِجُّ وَتَجِيشُ مِيَاهُهَا. تَتَزَعْزَعُ ٱلْجِبَالُ بِطُمُوِّهَا. سِلَاهْ. ٣ 3
Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ, maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. (Sela)
نَهْرٌ سَوَاقِيهِ تُفَرِّحُ مَدِينَةَ ٱللهِ، مَقْدِسَ مَسَاكِنِ ٱلْعَلِيِّ. ٤ 4
Otu iyi dị nke na-asọbata na-eweta ọṅụ nʼime obodo Chineke, nʼime ebe obibi dị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu.
ٱللهُ فِي وَسَطِهَا فَلَنْ تَتَزَعْزَعَ. يُعِينُهَا ٱللهُ عِنْدَ إِقْبَالِ ٱلصُّبْحِ. ٥ 5
Chineke bi nʼime ya, ọ gaghị ada; Chineke ga-enyere ya aka mgbe chi bọrọ.
عَجَّتِ ٱلْأُمَمُ. تَزَعْزَعَتِ ٱلْمَمَالِكُ. أَعْطَى صَوْتَهُ، ذَابَتِ ٱلْأَرْضُ. ٦ 6
Mba niile na-agba aghara, alaeze niile na-adakwa; o welitere olu ya elu, ụwa na-agbaze.
رَبُّ ٱلْجُنُودِ مَعَنَا. مَلْجَأُنَا إِلَهُ يَعْقُوبَ. سِلَاهْ. ٧ 7
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị; Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. (Sela)
هَلُمُّوا ٱنْظُرُوا أَعْمَالَ ٱللهِ، كَيْفَ جَعَلَ خِرَبًا فِي ٱلْأَرْضِ. ٨ 8
Bịa, hụrụ ihe ebube niile Onyenwe anyị mere, lee oke ịla nʼiyi niile o webatara nʼelu ụwa.
مُسَكِّنُ ٱلْحُرُوبِ إِلَى أَقْصَى ٱلْأَرْضِ. يَكْسِرُ ٱلْقَوْسَ وَيَقْطَعُ ٱلرُّمْحَ. ٱلْمَرْكَبَاتُ يُحْرِقُهَا بِٱلنَّارِ. ٩ 9
Ọ na-eme ka agha kwụsị ruo nsọtụ nke elu ụwa niile. Ọ na-agbaji ụta, na-ebibi ùbe, ma na-esu ọta agha niile ọkụ.
كُفُّوا وَٱعْلَمُوا أَنِّي أَنَا ٱللهُ. أَتَعَالَى بَيْنَ ٱلْأُمَمِ، أَتَعَالَى فِي ٱلْأَرْضِ. ١٠ 10
Ọ na-asị, “Nọọnụ juu! Maranụ na mụ onwe m bụ Chineke! A ga-ebuli m elu nʼetiti mba niile, a ga-ebulikwa m elu nʼụwa.”
رَبُّ ٱلْجُنُودِ مَعَنَا. مَلْجَأُنَا إِلَهُ يَعْقُوبَ. سِلَاهْ. ١١ 11
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị; Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. (Sela)

< اَلْمَزَامِيرُ 46 >