< اَلْمَزَامِيرُ 17 >

صَلَاةٌ لِدَاوُدَ اِسْمَعْ يَارَبُّ لِلْحَقِّ. أَنْصِتْ إِلَى صُرَاخِي. أَصْغِ إِلَى صَلَاتِي مِنْ شَفَتَيْنِ بِلَا غِشٍّ. ١ 1
Ekpere Devid. O Onyenwe anyị, nụrụ arịrịọ m ziri ezi, nụrụkwa mkpu akwa m. Gee ntị nʼekpere m nʼihi na o siteghị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu okwu aghụghọ.
مِنْ قُدَّامِكَ يَخْرُجُ قَضَائِي. عَيْنَاكَ تَنْظُرَانِ ٱلْمُسْتَقِيمَاتِ. ٢ 2
Ka mkpepụta m si nʼaka gị bịa; ka anya gị hụ ihe ziri ezi.
جَرَّبْتَ قَلْبِي. تَعَهَّدْتَهُ لَيْلًا. مَحَّصْتَنِي. لَا تَجِدُ فِيَّ ذُمُومًا. لَا يَتَعَدَّى فَمِي. ٣ 3
Ọ bụ ezie na ị nyochaala obi m, i letala m nʼabalị, nwalekwaa m, ị ga-achọpụta na o nweghị ihe ọ ọjọọ bụla m zubere, na ọnụ m ekwuhiebeghị.
مِنْ جِهَةِ أَعْمَالِ ٱلنَّاسِ فَبِكَلَامِ شَفَتَيْكَ أَنَا تَحَفَّظْتُ مِنْ طُرُقِ ٱلْمُعْتَنِفِ. ٤ 4
Ndị mmadụ agbalịala inye m ngarị ma anaghị m ekwe ka mụ na ndị na-eme ihe ike nwee mmekọrịta nʼihi iwu sitere nʼegbugbere ọnụ gị.
تَمَسَّكَتْ خُطُوَاتِي بِآثَارِكَ فَمَا زَلَّتْ قَدَمَايَ. ٥ 5
Nzọ ụkwụ m akpafubeghị site nʼụzọ gị, ụkwụ m agbụchapụghịkwa site nʼọnọdụ ya.
أَنَا دَعَوْتُكَ لِأَنَّكَ تَسْتَجِيبُ لِي يَا ٱللهُ. أَمِلْ أُذُنَيْكَ إِلَيَّ. ٱسْمَعْ كَلَامِي. ٦ 6
Ana m akpọku gị, O Chineke, nʼihi na amaara m na ị ga-aza m; gee m ntị ma nụrụ ekpere m.
مَيِّزْ مَرَاحِمَكَ، يَامُخَلِّصَ ٱلْمُتَّكِلِينَ عَلَيْكَ، بِيَمِينِكَ مِنَ ٱلْمُقَاوِمِينَ. ٧ 7
Zipụta ịhụnanya gị dị oke ebube; gị onye na-eji aka nri gị dị ike azọpụta ndị niile gbabara na gị site nʼaka ndị iro ha.
ٱحْفَظْنِي مِثْلَ حَدَقَةِ ٱلْعَيْنِ. بِظِلِّ جَنَاحَيْكَ ٱسْتُرْنِي ٨ 8
Chebe m dịka mkpụrụ anya gị; zoo m na ndo nke nku gị,
مِنْ وَجْهِ ٱلْأَشْرَارِ ٱلَّذِينَ يُخْرِبُونَنِي، أَعْدَائِي بِٱلنَّفْسِ ٱلَّذِينَ يَكْتَنِفُونَنِي. ٩ 9
site nʼaka ndị ajọ omume gbara m gburugburu, ọ bụladị ndị iro m, ndị chọrọ igbu m.
قَلْبَهُمُ ٱلسَّمِينَ قَدْ أَغْلَقُوا. بِأَفْوَاهِهِمْ قَدْ تَكَلَّمُوا بِٱلْكِبْرِيَاءِ. ١٠ 10
Ha anaghị eme ebere, ha bụ ndị afọ tara mmiri, okwu ịnya isi juru ha ọnụ.
فِي خُطُوَاتِنَا ٱلْآنَ قَدْ أَحَاطُوا بِنَا. نَصَبُوا أَعْيُنَهُمْ لِيُزْلِقُونَا إِلَى ٱلْأَرْضِ. ١١ 11
Ha achọpụtala ebe m nọ, ugbu a, ha gbara m gburugburu, ha ji anya nkọ, jikerekwa ịtụ m nʼala.
مَثَلُهُ مَثَلُ ٱلْأَسَدِ ٱلْقَرِمِ إِلَى ٱلِٱفْتِرَاسِ، وَكَٱلشِّبْلِ ٱلْكَامِنِ فِي عِرِّيسِهِ. ١٢ 12
Ha ka ọdụm agụụ na-agụ nke zoro onwe ya nʼọhịa, dịka ọdụm dị ike na-eche ihe ọ ga-adọgbu.
قُمْ يَارَبُّ. تَقَدَّمْهُ. اِصْرَعْهُ. نَجِّ نَفْسِي مِنَ ٱلشِّرِّيرِ بِسَيْفِكَ، ١٣ 13
Onyenwe anyị, bilie guzogide ha, tigbuo ha. Jiri mma agha gị zọpụta m site nʼaka ndị ajọ omume.
مِنَ ٱلنَّاسِ بِيَدِكَ يَارَبُّ، مِنْ أَهْلِ ٱلدُّنْيَا. نَصِيبُهُمْ فِي حَيَاتِهِمْ. بِذَخَائِرِكَ تَمْلَأُ بُطُونَهُمْ. يَشْبَعُونَ أَوْلَادًا وَيَتْرُكُونَ فُضَالَتَهُمْ لِأَطْفَالِهِمْ. ١٤ 14
O Onyenwe anyị, zọpụta m site nʼaka ndị dị otu a, site nʼaka ndị ụgwọ ọrụ ha bụ nʼụwa a. Ka ihe ịkpakọbara debere ndị ajọ omume jupụta afọ ha, ka afọ jukwa ụmụ site nʼihe ndị a, ka ha hapụrụ ihe fọdụrụ nye ụmụntakịrị ha.
أَمَّا أَنَا فَبِالْبِرِّ أَنْظُرُ وَجْهَكَ. أَشْبَعُ إِذَا ٱسْتَيْقَظْتُ بِشَبَهِكَ. ١٥ 15
Ma mụ onwe m ga-ahụ ihu gị site nʼezi omume; mgbe m ga-ebili, afọ ga-eju m nke ọma, nʼihi na aga m ahụ gị ihu na ihu.

< اَلْمَزَامِيرُ 17 >