< أَيُّوبَ 9 >

فَأَجَابَ أَيُّوبُ وَقَالَ: ١ 1
Job zara sị:
«صَحِيحٌ. قَدْ عَلِمْتُ أَنَّهُ كَذَا، فَكَيْفَ يَتَبَرَّرُ ٱلْإِنْسَانُ عِنْدَ ٱللهِ؟ ٢ 2
“Nʼezie, amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu. Ma mmadụ dị ndụ ọ ga-esi aṅaa gosi na ya bụ onye aka ya dị ọcha nʼihu Chineke?
إِنْ شَاءَ أَنْ يُحَاجَّهُ، لَا يُجِيبُهُ عَنْ وَاحِدٍ مِنْ أَلْفٍ. ٣ 3
Ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịjụ mmadụ ajụjụ, ebee ka mmadụ ahụ nọ nke nwere ike ịza ọ bụladị otu nʼime ajụjụ dị iche iche Chineke ga-ajụ ya?
هُوَ حَكِيمُ ٱلْقَلْبِ وَشَدِيدُ ٱلْقُوَّةِ. مَنْ تَصَلَّبَ عَلَيْهِ فَسَلِمَ؟ ٤ 4
Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara, onye guzogidere ya ma hapụ imerụ ahụ?
ٱلْمُزَحْزِحُ ٱلْجِبَالَ وَلَا تَعْلَمُ، ٱلَّذِي يَقْلِبُهَا فِي غَضَبِهِ. ٥ 5
Ọ na-enugharị ugwu ukwu ma ha adịghị ama nke a, na-akwatụ ha nʼiwe ya.
ٱلْمُزَعْزِعُ ٱلْأَرْضَ مِنْ مَقَرِّهَا، فَتَتَزَلْزَلُ أَعْمِدَتُهَا. ٦ 6
Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya, mee ka ogidi ya maa jijiji.
ٱلْآمِرُ ٱلشَّمْسَ فَلَا تُشْرِقُ، وَيَخْتِمُ عَلَى ٱلنُّجُومِ. ٧ 7
Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha; ọ na-emenyụ ìhè kpakpando na-enye.
ٱلْبَاسِطُ ٱلسَّمَاوَاتِ وَحْدَهُ، وَٱلْمَاشِي عَلَى أَعَالِي ٱلْبَحْرِ. ٨ 8
Naanị ya gbasara mbara eluigwe, ọ na-agakwa ije nʼelu ebili mmiri nke oke osimiri.
صَانِعُ ٱلنَّعْشِ وَٱلْجَبَّارِ وَٱلثُّرَيَّا وَمَخَادِعِ ٱلْجَنُوبِ. ٩ 9
Ọ bụ ya mere kpakpando Bịaa, na Orion na Pleiades, na kpakpando niile nke ndịda eluigwe.
فَاعِلُ عَظَائِمَ لَا تُفْحَصُ، وَعَجَائِبَ لَا تُعَدُّ. ١٠ 10
Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta, ihe ịrịbama nke ọnụ na-enweghị ike ịgụta.
«هُوَذَا يَمُرُّ عَلَيَّ وَلَا أَرَاهُ، وَيَجْتَازُ فَلَا أَشْعُرُ بِهِ. ١١ 11
Mgbe ọ na-esi nʼakụkụ m agafe, enweghị m ike ịhụ ya, mgbe ọ na-agabiga, adịghị m amata na ọ bụ ya.
إِذَا خَطَفَ فَمَنْ يَرُدُّهُ؟ وَمَنْ يَقُولُ لَهُ: مَاذَا تَفْعَلُ؟ ١٢ 12
Ọ bụrụ na ọ pụnara ihe, onye na-akwụsị ya? Onye kwa pụrụ ịjụ ya si, ‘Gịnị ka ị na-eme?’
ٱللهُ لَا يَرُدُّ غَضَبَهُ. يَنْحَنِي تَحْتَهُ أَعْوَانُ رَهَبَ. ١٣ 13
Chineke adịghị eme ka iwe ya laghachi, ọbụladị ndị inyeaka Rehab, ruru ala nʼụkwụ ya.
كَمْ بِٱلْأَقَلِّ أَنَا أُجَاوِبُهُ وَأَخْتَارُ كَلَامِي مَعَهُ؟ ١٤ 14
“Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ, maọbụ mụ na ya ịrụrịta ụka?
لِأَنِّي وَإِنْ تَبَرَّرْتُ لَا أُجَاوِبُ، بَلْ أَسْتَرْحِمُ دَيَّانِي. ١٥ 15
Nʼagbanyeghị na aka m dị ọcha, apụghị m ịsa ya okwu; kama m ga-arịọ onye ikpe m ka o mere m ebere.
لَوْ دَعَوْتُ فَٱسْتَجَابَ لِي، لَمَا آمَنْتُ بِأَنَّهُ سَمِعَ صَوْتِي. ١٦ 16
A sịkwarị na m kpọọ ya oku, ọ za m, ekwenyeghị m na ọ ga-ege m ntị.
ذَاكَ ٱلَّذِي يَسْحَقُنِي بِٱلْعَاصِفَةِ، وَيُكْثِرُ جُرُوحِي بِلَا سَبَبٍ. ١٧ 17
Ọ ga-eji oke ifufe tirie m, meekwa ka ihe mgbu m baa ụba na-enweghị ihe butere ya.
لَا يَدَعُنِي آخُذُ نَفَسِي، وَلَكِنْ يُشْبِعُنِي مَرَائِرَ. ١٨ 18
Ọ gaghị ekwe ka iku ume m lọghachi kama ọ ga-eji iru ụjụ kpuchie m.
إِنْ كَانَ مِنْ جِهَةِ قُوَّةِ ٱلْقَوِيِّ، يَقُولُ: هَأَنَذَا. وَإِنْ كَانَ مِنْ جِهَةِ ٱلْقَضَاءِ يَقُولُ: مَنْ يُحَاكِمُنِي؟ ١٩ 19
Ọ bụrụ ihe e ji ike eme, lee na ọ dị ike nke ukwuu! Ọzọ ọ bụrụ nʼikpe ziri ezi, onye pụrụ iguzogide ya.
إِنْ تَبَرَّرْتُ يَحْكُمُ عَلَيَّ فَمِي، وَإِنْ كُنْتُ كَامِلًا يَسْتَذْنِبُنِي. ٢٠ 20
A sịkwarị na aka m dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe; ọ bụrụ na abụ m onye na-enweghị ịta ụta, ọ ga-agụ m nʼonye ikpe mara.
«كَامِلٌ أَنَا. لَا أُبَالِي بِنَفْسِي. رَذَلْتُ حَيَاتِي. ٢١ 21
“Ọ bụ ezie na abụ m onye ikpe na-amaghị ejighị m onwe m kpọrọ ihe; nʼezie ana m eleda ndụ m anya.
هِيَ وَاحِدَةٌ. لِذَلِكَ قُلْتُ: إِنَّ ٱلْكَامِلَ وَٱلشِّرِّيرَ هُوَ يُفْنِيهِمَا. ٢٢ 22
Otu ihe ahụ ka ọ bụ; nʼihi ya ka m ji asị, ‘Ọ na-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi.’
إِذَا قَتَلَ ٱلسَّوْطُ بَغْتَةً، يَسْتَهْزِئُ بِتَجْرِبَةِ ٱلْأَبْرِيَاءِ. ٢٣ 23
Mgbe ịpịa ụtarị wetara ọnwụ mberede, ọ na-achị enweghị olileanya nke ndị na-enweghị ihe ha mere ọchị.
ٱلْأَرْضُ مُسَلَّمَةٌ لِيَدِ ٱلشِّرِّيرِ. يُغَشِّي وُجُوهَ قُضَاتِهَا. وَإِنْ لَمْ يَكُنْ هُوَ، فَإِذًا مَنْ؟ ٢٤ 24
Mgbe ala dabara nʼaka ndị na-emebi iwu, ọ na-ekpuchi ndị ọkaikpe anya. Ọ bụrụ na ọ bụghị ya na-eme ya, onye kwanụ bụ onye ahụ na-eme ya?
أَيَّامِي أَسْرَعُ مِنْ عَدَّاءٍ، تَفِرُّ وَلَا تَرَى خَيْرًا. ٢٥ 25
“Ụbọchị ndụ m dị gara gara karịa onye ọgba ọsọ; ha na-agafekwa na-ahụtụghị ọṅụ anya.
تَمُرُّ مَعَ سُفُنِ ٱلْبَرْدِيِّ. كَنَسْرٍ يَنْقَضُّ إِلَى قَنَصِهِ. ٢٦ 26
Ha na-agafe dịka ụgbọ mmiri papịrọs, dịka mgbe ugo na-efeda ngwangwa ijide anụ ọ ga-eri.
إِنْ قُلْتُ: أَنْسَى كُرْبَتِي، أُطْلِقُ وَجْهِي وَأَتَبَلَّجُ، ٢٧ 27
Ọ bụrụ na m sị, ‘Aga m echefu mkpesa m, aga m agbanwe ihu m, nwee ihu ọchị.’
أَخَافُ مِنْ كُلِّ أَوْجَاعِي عَالِمًا أَنَّكَ لَا تُبَرِّئُنِي. ٢٨ 28
Nsogbu m niile ka na-atụ m egwu nʼihi na amara m na ị gaghị ewere m dịka onye aka ya dị ọcha.
أَنَا مُسْتَذْنَبٌ، فَلِمَاذَا أَتْعَبُ عَبَثًا؟ ٢٩ 29
Ebe m bụrịị onye ikpe mara, nʼihi gịnị ka m ji na-adọgbu onwe m nʼefu?
وَلَوِ ٱغْتَسَلْتُ فِي ٱلثَّلْجِ، وَنَظَّفْتُ يَدَيَّ بِٱلْإِشْنَانِ، ٣٠ 30
A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ m werekwa soda saa aka m abụọ,
فَإِنَّكَ فِي ٱلنَّقْعِ تَغْمِسُنِي حَتَّى تَكْرَهَنِي ثِيَابِي. ٣١ 31
ị ga-enuba m nʼolulu apịtị nke pụrụ ime ka uwe m yi nʼahụ m kpọọ m asị.
لِأَنَّهُ لَيْسَ هُوَ إِنْسَانًا مِثْلِي فَأُجَاوِبَهُ، فَنَأْتِي جَمِيعًا إِلَى ٱلْمُحَاكَمَةِ. ٣٢ 32
“Ọ bụghị mmadụ efu dịka m nke m ga-aza ya, ka anyị abụọ kpọrịtaa onwe anyị ikpe nʼụlọikpe.
لَيْسَ بَيْنَنَا مُصَالِحٌ يَضَعُ يَدَهُ عَلَى كِلَيْنَا. ٣٣ 33
A sịkwarị na e nwere onye odozi okwu nʼetiti mụ na gị, onye ga-ebikwasị anyị abụọ aka ya,
لِيَرْفَعْ عَنِّي عَصَاهُ وَلَا يَبْغَتْنِي رُعْبُهُ. ٣٤ 34
onye ga-ewepụ mkpara Chineke site nʼebe m nọ, ka oke egwu ya gharakwa ịtụ m ọzọ.
إِذًا أَتَكَلَّمُ وَلَا أَخَافُهُ، لِأَنِّي لَسْتُ هَكَذَا عِنْدَ نَفْسِي. ٣٥ 35
Mgbe ahụ ka m ga-ekwu okwu na-atụghị ya egwu; ma ka ọ dị ugbu a ọ dịghị ihe m nwere ike ime.

< أَيُّوبَ 9 >