< Uruyan Yuhana 6 >

1 Men yene kubi ko na Kukam npuno utursu kuzor, nlanza umon na nya ninawa tene nlai woro nin liwui na liwadi nafo ututuzo, “Da!”
Ahụrụ m mgbe Nwa atụrụ ahụ meghere otu nʼime akara asaa ahụ. Otu nʼime anụ anọ ahụ dị ndụ tiri mkpu dịka a ga-asị na ọ bụ egbe eluigwe sị, “Bịa!”
2 Men yene kabarak kaboo, unan nkowe wa min utah, inani wa nighe litapa tigo. A nuzu nafo unan li likum na le likum.
Mgbe m lere anya, ahụrụ m ịnyịnya dị ọcha. Onye na-anọkwasị nʼelu ya ji ụta nʼaka ya. A tụkwasịkwara okpueze nʼisi ya dịka onye agha na-emeri emeri mgbe niile.
3 Ku kame puno utursu unbe, nlanza finawa fin nbe woro, “Da!”
Mgbe o meghere akara nke abụọ, ngwangwa, anụrụ m ka anụ nke abụọ ahụ nʼime anụ anọ ndị ahụ dị ndụ tiri mkpu sị, “Bịa!”
4 Kan kabarik nuzu kashine ka din zue kiti. Iwa yininghe akalla nsheu nayi nan nya inye, bara anite nan molso atimine. Uwa in unan kabarak ko sangali ku dia.
Mgbe ahụ, ịnyịnya ọzọ na-acha ọbara ọbara pụtara. E nyere onye nọkwasịrị nʼelu ya ike iwepụ udo nʼụwa nakwa ime ka ụmụ mmadụ na-egburita ibe ha. E nyekwara ya mma agha dị ukwuu.
5 Kubi na kuzara npuno utursu un tatte, nlanza makeke nlai un tatte nworo, “Da!” Nyene kabarak kasirne, unan nko we wa min kuwatan ncara mye.
Ma mgbe o meghere akara nke atọ, anụrụ m ka anụ nke atọ ahụ dị ndụ kwuru, “Bịa!” Ahụrụ m ịnyịnya dị ojii. Onye na-anọkwasị nʼelu ya ji ihe ọtụtụ abụọ nʼaka ya.
6 Nlanza imomon nafo liwui nan nya makeke nlai nanase woro, “Kuyanga alkama ba yitu fisulei, ayanga attat tutun fisulei. Na uwa nanza nnuf nin nmyen narau ba.”
Anụkwara m ihe dị ka olu nke sitere nʼetiti anụ anọ ahụ dị ndụ na-adapụta sị, “Otu ihe ọtụtụ kilo nke ọka wiiti bụ ụgwọ ọrụ otu ụbọchị, ihe ọtụtụ kilo atọ nke ọka balị bụkwa ụgwọ ọrụ otu ụbọchị. Ya mere, unu emebikwala mmanụ oliv na mmanya.”
7 Kubi na kuzara npuno utursu un nase makeke man nase woor, “Da!”
Mgbe o meghere akara nke anọ, anụrụ m ka anụ nke anọ dị ndụ sịrị, “Bịa!”
8 Nyene kabarak ka naki di pom. Unan nko kanin lisa mye likul, iwa nighe likara kitene nimon inas nan nya inye, a mollu inin nin liyop, kukpon, ukonu, nin ninawa kusho nan nya inye. (Hadēs g86)
Elere m anya ma hụ ịnyịnya na-acha ntụntụ nʼihu m. Aha onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ Ọnwụ na Ọkụ ala mmụọ na-esokwa ya nʼazụ. E nyere ha ike nʼebe otu ụzọ nʼụzọ anọ nke ụwa dị ka ha jiri mma agha na ụnwụ, na ọrịa ọjọọ na anụ ọhịa gbuchapụ ndị bi nʼime ha. (Hadēs g86)
9 Kubi na kuzare npuno utursu un tau, nyene kadas nbagadi nidowo nalenge na iwa mollu nani bara ligbulang kutelle nin shaida mine na iwa min nin liwui lirum.
Ma mgbe ọ meghere akara nke ise, ahụrụ m nʼokpuru ebe ịchụ aja mkpụrụobi ndị niile e gburu egbu nʼihi okwu Chineke na nʼihi ịgba ama nke ha jidesiri ike.
10 Inung su kuculu nin liwui kang, “Udu nin shiyari iba su tigo kitene bite vat, nlau nin kidegen, se uwucu kidegenkidegen nalenge na isosin nan nya inye, se ubiya nmyi bite?”
Ha ji oke olu tie mkpu na-asị, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, onye dị nsọ na onye eziokwu, ruo olee mgbe ka ị na-eche ikpe ụwa na ndị bi nʼime ya ikpe ma bọọkwa ọbọ nʼisi ha maka ọbara anyị ha wufuru?”
11 Vat mine iwa ni ko ghaku ushot uboo, ibelle nani au icica baat, se ise ukulunu nadon licin mine, nuana mine ni lime nan nishono nda duru, alenge na iba mollu nani, nafo na ina malu umolu nani.
E nyere ha nʼotu nʼotu uwe ọcha, a gwakwara ha ka ha zuru ike nwa oge nta, tutu ruo mgbe ọnụọgụgụ ndị ozi ibe ha na ụmụnna ha a ga-egbu dịka e gburu ha ga-ezu.
12 Kubi na kuzara npuno utursu un tocine, na nwadi ncawe uhirtuzu kutyin wa duku. Uwui so usirne nafo ticini, unin upui ye so nafo nmyi.
Anọkwa m na-ele anya mgbe o meghere akara nke isii ahụ. Nke a mere ka oke ala ọma jijiji dịrị. Anyanwụ gbara ọchịchịrị dị ka akwa mkpe e jiri ajị mee. E mekwara ka ọnwa chaa uhie uhie dịka ọbara.
13 Iyini kitene kani disso nan nya inyi, nafo na affa kuka asa idiso kubi liyinin, na ifunu wa zinlinghe.
Mgbe ahụ, kpakpando dị na mbara eluigwe malitere ịdapụ nʼala dịka mkpụrụ osisi fiig na-achaghị acha si adapụ mgbe oke ifufe na-efegharị ya.
14 Kitene kani sa ki wullu nafo kuffa ninyerte na ijinkpilo. Ko lome likup nin npege iwa kala nani kiti mine.
Mbara eluigwe gabigara, dịka akwụkwọ mgbe a na-apịakọta ya. Ugwu niile na agwa etiti niile ka e wepụkwara site nʼọnọdụ ha.
15 Anug ago nyulele nan nanit agegeme addidia, anan nimon nacara, anan nakara, nan ko gha tutun, kucin nin nlenge na ibunku ghe, nyeshine nan nya natai, nan natala nakup.
Ndị eze niile nke ụwa na ndị nọ nʼọchịchị dị iche iche, na ndị ọgaranya, na ndị nọ nʼọnọdụ dị elu, na ndị ọchịagha, na ndị mmadụ niile dị iche iche, ndị ukwu ma ndị nta, ndị ohu na ndị nwe onwe ha, ha niile gara zoo onwe ha nʼime ọgba nkume na nʼokpuru ugwu,
16 Iworo nakupe nan natale, “Disson kitene bite! Nyeshen nari nmoru nlenge na asosin kitene kutet tigo nin tinana nayi kuzara.
ha na-eti mkpu na-arịọ ugwu ndị ahụ na-asị, “Dakwasịnụ anyị zoo anyị ka onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ocheeze ahụ hapụ ịhụ anyị, ka oke iwe nke Nwa Atụrụ ahụ hapụ ịbịakwasị anyị.
17 Bara liyiri lidia tinana nayi ndah, ghari nwasa ayisina?”
Nʼihi na, lee oke ụbọchị iwe ha abịala, onye pụrụ ịgbanarị ya?”

< Uruyan Yuhana 6 >