< Matiyu 24 >

1 Yesu nuzu nanya kutii nlira a tunna ncin me; non katwa me da kitime ida dursoghe makeke kutii nlira.
Mgbe Jisọs si nʼụlọnsọ ahụ na-apụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya na-achọ igosi ya akụkụ dị iche iche nke ụlọnsọ ukwu ahụ.
2 A kpana aworo nani, na anung din yenju ile imone vat ba? “Idin bellu minu kidegen, na litala lirum duku longo na ima sunu kitene ilong sa ukpiliwu ba.”
Ma ọ zara ha sị, “Unu hụrụ ihe ndị a niile? Nʼezie agwa m unu, oge na-abịa mgbe ọ bụladị otu nkume na-agaghị adịgidekwa nʼelu ibe ya, nke a na-agaghị akwatu nʼala.”
3 Na aso likup in Zaitun, non katwa me da kitime likot iworo. “Belle nari, ile imone mayitu nishiyari? Iyaghari ma dursu udakfe nin nimalin inyii? (aiōn g165)
Mgbe ọ nọdụrụ ala nʼelu Ugwu Oliv, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya iche, sị, “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama nke oge i ji alọghachi na nke ọgwụgwụ ụwa a?” (aiōn g165)
4 Yesu kpana aworo nani. “Yenjen umon wa rusuzu minu.
Jisọs zara ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu ụzọ.
5 Bara anit gbardang ma dak nin lissa ning; ima woru 'myari Kristi', tutung ima rusuzu anit gbardang.
Nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m, na-ekwu sị, ‘Abụ m Kraịst ahụ.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ụzọ.
6 Ima lanzu ubeleng likum nin liru likum; yenjen ayi mine wa fita, bara ilenge imone ma dak gbas a na imaline nsa da ba.
Mgbe unu nụrụ ụzụ agha, na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu, nʼihi na ihe ndị a aghaghị ime. Ma ha anaghị egosi na ọgwụgwụ oge eruola.
7 Bara nmon min ma fitu nivira nin mon min, tigo kitene ntong tigo. Ima su akpon nin hirtizu nmyen niti niti.
Mba ga-ebili megide mba ibe ya, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ; oke ụnwụ, na ala ọma jijiji ga-adịkwa nʼọtụtụ ebe dị iche iche.
8 Vat ninlenge imone ma yitu ucizunu nniuwari.
Ma ihe ndị a niile bụ naanị mmalite ịta ahụhụ nke ga-abịa.
9 Tutung ima nin nakpu minu nacara na lenge na ima timinu ineo, imolsu minu. Uyii vat ma nari minu bara blissa ning.
“Mgbe ahụ ha ga-arara unu nyefee nʼaka ndị ga-ata unu ahụhụ. Ha ga-egbukwa unu. Mba niile ga-akpọ unu asị nʼihi m.
10 Anit gbardang ma tirzu inin lessu ati.
Ọtụtụ ga-ada site nʼokwukwe ha nʼoge ahụ. Ha ga-emekwa ka ibe ha ma nʼọnya, kpọọkwa ibe ha asị.
11 Anan bellu liru nin nuu Kutelle kinu ma fitu gbardang, iba wultunu anit gbardang.
Mgbe ahụ ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ.
12 Bara na likara linanzang bati gbardang usu nanit ma ti camcam.
Nʼihi na ajọ omume bara ụba nʼebe niile, ịhụnanya ọtụtụ ndị mmadụ nʼebe ibe ha nọ ga-ajụ oyi.
13 Vat ulenge na a tere kibinayi nanya neu udu imalne, amere ma se utucu.
Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.
14 Ule uliru umang nbelleng kipin tigo Kutelle ima su unin nyii vat unan so kutuf kunba timin timin vat; imaline ma nin dak.
A ga-ekwusa oziọma nke alaeze ahụ nye ụwa niile ka ọ bụrụ ihe ama nye mba niile. Emesịa ọgwụgwụ oge ahụ ga-abịa.
15 Nene asa iyene adadu an fiu, alenge na Daniel unan liru nin nuu Kutelle wa bellin, yissin nanya kiti kilau, (na unan bellu niyerte yinnin).
“Ya mere, mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi, nke e kwuru okwu ya site nʼọnụ Daniel onye amụma, ka ọ na-eguzo nʼebe nsọ (onye na-agụ ya nwee nghọta ihe ọ pụtara).
16 na alenge na idi in Yahudiya cum udu akup.
Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu.
17 na ame ulenge na kitene kutii kitene nwa tolu adi yiru imonmong nan nya kilare ba.
Ka onye nọ nʼelu ụlọ ghara ịrịdata ka ọ banye nʼime ụlọ ya, ịkwapụta ngwongwo dị nʼime ụlọ ya.
18 ame ulenge na adi kunen na awa kpilin kilari ada yiru ugudun ba.
Ka onye nọ nʼubi ghara ịlọghachi nʼụlọ ya ịchịrị uwe ya.
19 Ushe nawani alenge na ima yitu nin naburi, nin nalenge na ima yitunmazunun nono kubi kone!
Ma ịta ahụhụ ga-adịrị ndị nwanyị di ime, na ndị na-enye ụmụaka ara nʼụbọchị ahụ
20 Sun nlira na ucum mine waso nin kubi likus sa liri na Sabbat ba.
Kpesienụ ekpere ike ka unu ghara ịgba ọsọ a nʼoge oke oyi, maọbụ nʼụbọchị izuike.
21 Bara uniu ma yitu kang, umusun lenge na isa su unin ba tun ucizunu inyii udak kitimone, ana imakuru isu umusun nnin ba.
Nʼihi na oke mkpagbu ga-adị, ụdị nke ụwa na-ahụbeghị mbụ, na nke anya na-agaghị ahụkwa ọzọ site na mmalite ụwa ruo mgbe ahụ.
22 Sasa na ima canu ayiri ane ba, na unit wase utucu ba; bara alenge na ina fere, inani ma canu ayiri ane.
“Ọ bụrụ na-emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ, o nweghị onye a ga-azọpụta, ma nʼihi ndị ya ọ họpụtara, ụbọchị ndị ahụ ga-adị mkpụmkpụ.
23 Asa umong woro minu, yeneng Kristi ule; sa a “Kristi uni” na iwa yinin ba.
Mgbe ahụ, ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘Lee ya nʼebe ahụ,’ unu ekwela.
24 Anan kinuu nKristi nin nanan liru nin nuu Kutelle kinuu ma dak isu imon fiu izikiki gbardang, iwultun anit libau, umunu wang alenge na imal ferui nani.
Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eme ihe oke ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ha ga-esite nʼọrụ ebube ha ga-arụ duhie, ọ bụladị ndị ahụ a họpụtara.
25 Yenen nbellin minu a kubi dutu sa udak
Lee, agwala m unu ihe ndị a, mgbe ha na-emebeghị.
26 Bara nani, iwa bellin minu, “yenen, Kristi di nanya kusho,” na iwa nuzu udue ba, iwan woro minu, adi nanya kutii limot, na iwa yinin ba.
“Ya mere, ọ bụrụ na ha asị unu, ‘Lee, ọ nọ nʼime ọzara,’ unu agakwala. Ọ bụrụkwa na ha asị unu, ‘Lee, ọ nọ nʼime ime ụlọ,’ unu ekwela.
27 Nafo na umalzinu kiti asa unya kusari kitene udu kadas, nanere wang udak in Saun in Nit ma yitu.
Nʼihi na ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka amụma na-egbu nʼọwụwa anyanwụ nke a na-ahụ anya nʼọdịda anyanwụ.
28 Kikanga na libi nonku kikanere agbulluk ma pitirnu ku.
Matakwanụ na ebe ọbụla ozu dị, nʼebe ahụ ka udele na-ezukọta.
29 Kimal na leli ayiri nniuwe uwui ma siriu, na upui mani nkanang me ba, iyini ma dissu unuzu kitene kane, akara kitene kani ma zullunu kidowo.
“Ngwangwa mgbe mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ niile gabigasịrị, “‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị. Ọnwa agaghị enyekwa ìhè, kpakpando ga-esi na mbara eluigwe daa, ike niile nke eluigwe ga-ama jijiji.’
30 Udursu kulap ndak in Saun in Nit ma nuzu kanang kitene kani, vat tilem inyii ma su tiyom. Ima yenu Usaun Nnit din cinu nanya nawut kitene kani nin likara a ngogong midya.
“Nʼoge ahụ akara ngosi nke Nwa nke Mmadụ ga-apụta ihe na mbara eluigwe. Agbụrụ niile nke ụwa ga-anọkwa na-eru ụjụ. Ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼigwe ojii, nʼike nakwa oke ebube.
31 Ama nin tu nono kadura me nin liwui kulangtung kanan, inung manin pitirunghe anit alau me na sari anas vat kiti kirum, unuzu nlo ligang kitene kani udu loli liganghe.
Ọ ga-ewerekwa olu opi ike zipụ ndị mmụọ ozi ka ha gaa kpọkọtaa ndị niile a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke eluigwe na ụwa.
32 Sen uyinu nimoimon kiti kuca kupau. Asa ulang in nutuno tifa tipese, yinnon kussik nda susut.
“Ugbu a mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya malitere iwepụta ome dị nro, na-epupụtakwa akwụkwọ ndụ maranụ na ọkọchị na-abịa nso.
33 Nanere wang, asa iyene ile imone, yinnon nworu a daduru, adi susut nin kibulunghe.
Otu a kwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a niile ka ha na-eme marakwanụ na ọ nọ nso, ọ bụladị nʼọnụ ụzọ unu.
34 Kidegennere nbellin minu, na ko kuje ma katu ba, se ilenge imone nse ukulu vat.
Nʼezie agwa m unu, ihe ndị a niile aghaghị imezu tupu ọgbọ a agabiga.
35 Kitene kani nin kadas ma katu, a na uliru ning ma katu ba.
Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.
36 Ubellen nwui une nin kube na umong yiru ba, umunun inung nono kadura kitene kane, sa Usaunne, Uciffere cas yiru.
“Ma o nweghị onye ọbụla maara ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ ga-abụ. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi nọ nʼeluigwe amaghị ya. Ọkpara ahụ amakwaghị. Ọ bụ naanị Nna maara ya.
37 Nafo na ayirin Nuhu wadi, nanere ma yitu udak Nsaun Nnit.
Ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka ọ dị nʼụbọchị Noa.
38 Nafo aleli ayirin kulu nmyen inye wa dutu sa udak iwa din li iso, ipilla awani a iniza a shono mine nilugma udi duru lire na Nuhu wa piru uzirge,
Nʼoge ahụ tupu iju mmiri ahụ abịa, ndị mmadụ nọ na-eri na aṅụ, na-emekwa mmemme ọlụlụ di na nwunye, ruo ụbọchị Noa banyere nʼime ụgbọ mmiri ya.
39 na iwa yiru imoimon ba nmyene da kulo uye umila nani, nanere ma yitu udak Nsaun Nnit.
Ha amataghị ihe ga-eme tutu oke mmiri ahụ abịa kpochapụ ha niile. Otu ahụ ka ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị.
40 Ima se anit naba kunen; ima yiru unit urum, i sun urum.
Mmadụ abụọ ga na-arụkọ ọrụ nʼubi ha, a ga-ewepụ otu hapụkwa onye nke ọzọ.
41 Awani aba mayitu tiyazun; ima yiru urum, isun urum.
Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ nri na nkume igwe nri, a ga-ewere otu, ma hapụkwa nke ọzọ.
42 Nanya nani sun lisosin nca, bara na iyiru liri longo na cikilari mine ma dak ba.
“Nʼihi nke a, na-echenụ nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.
43 Yinnon ulele, Cikilari nwa yiru kubi kongo na ukiri din cinu, ama su uca na ama yinnu i puro kilae ipira ba.
Ma ghọtanụ nke a: Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ mara oge onye ohi ga-abịa nʼụlọ ya nʼabalị, ọ ga-anọ na nche nʼoge ahụ. Ọ gaghị ekwe ka onye ohi kụwaa ụlọ ya.
44 Nanere anung wang imasu uca bara Usaun Nnit ma dak kubi kongo na ima yiru ba.
Otu a ka unu onwe unu pụrụ isi nọgide na nche oge niile, nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya.
45 Ani ghari kucin kone kujijing, na kuyina cikilari me tighe in yenju ngame, anan niza nani imonli mine nanya kubi dert?
“Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ndị ohu nọ nʼezinaụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri nʼoge ya?
46 Unan nmari ari kucin kone, ulenge na cikilari me ma dak ada seghe nsu nani.
Ngọzị na-adịrị ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-alọghachi hụ na ọ na-eme otu a.
47 Nbellin minu kidegene cikilari une ma tardughe kitene nvat nimon ilenge na a dimun.
Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme ya onyeisi nke ihe niile o nwere.
48 Andi kucin kunanzang nworo nanya kibinei me. Cikilari nigye ndandauna;
Ma ọ bụrụ na ohu ahụ bụ onye ajọọ omume na-asị onwe ya, ‘Nna m ukwu anọọla ogologo oge,’
49 anin cizin ufo nadon licinme, anin li aso nin nanan so nadadu,
ọ bụrụkwa na o bido iti ndị ohu ibe ya ihe, sorokwa ndị ọṅụ oke mmanya na-eri, na-aṅụ.
50 Cikilari kucin kone ma dak liri longo na kucin kone nceo kibinei ku ba,
Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị.
51 Cikilari me ma kifigye a fogye anin ceo gye urume nan nanan rusuzu nati, kikanga na kuculu mayiti ku nin nyakku nayini.
Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ebe ndị ihu abụọ nọ. Ebe e nwere ịkwa akwa na ịta ikikere eze.

< Matiyu 24 >